Enwere mmeghari ohuru nke Chineke, nke a na-akpo HOLY GHOST SCHOOL. O di nnoo mfe, ma di ike. O di mfe ma di ike n'echiche na, site na ya, Chineke ga-agbanwe ndu gi na ndu nke ndi òtù ezinulo gi n'ime obere oge! Nsogbu ndi diworo kemgbe otutu afo, bu? ndi juru iga n'agbanyeghi mgbali nile, a ga-asachapu ihe ndi a nile site na MMIRI NDU, nke na-esi n'ocheeze Chineke na-asoputa. Mmiri nke ndu a ga-emetu gi aka site na HOLY GHOST SCHOOL. A ga-eme ihe ndi a niile na-enweghi mbo na mgba gi!
Ee, n'ime ihe ndi a niile agaghi acho ka ime otutu ihe. Naani i ga-ezu ike n'ihu Chineke mgbe O na-ejeghari, na-emere gi ihe ndi a niile. Mgba mgba anu ahu? anyi adikwaghi Chineke mkpa ozo. Ugbu a o choro ka anyi bata n'ihu Ya ma nu uto izu ike ya, ka O na-emechi oru o malitere na ndu anyi. Nke a bu oru nke izu-oke O na-aru ugbu a n'ime ndu umu Ya - site n'izu akwukwo nke mmuo nso. O bu otu n'ime mmemme ogwugwu oge nke Chineke ime ka nwunye Kraist diri njikere! (Mkpu 19:7).
O bu mmanya na-ato uto nke O debere maka anyi, maka ubochi ikpeazu. A na-enye mmanya ohuru ahu ugbu a.